2 Samuel 8:14
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.
2 Samuel 8:14 in English
2 Samuel 8:14 · Berean Standard Bible
He placed garrisons throughout Edom, and all the Edomites were subject to David. So the LORD made David victorious wherever he went.
Context
12Mba ndị a bụ: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek. O dokwara nsọ nye Onyenwe anyị ihe ọ kwatara nʼagha site nʼaka Hadadeza nwa Rehob, bụ eze Zoba. 13Devid meere onwe ya aha, mgbe o si nʼitigbu puku ndị ikom Edọm iri na asatọ na Ndagwurugwu Nnu lọghachite. 14O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara. 15Devid chịrị ndị Izrel niile, na-emere ndị ya ihe dị mma na ihe ziri ezi. O mesokwaghị onye ọbụla mmeso ọjọọ. 16Onyeisi ndị agha ya bụ Joab* nwa Zeruaya; ode akwụkwọ obodo bụ Jehoshafat, nwa Ahilud.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.