Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma.

2 Samuel 7:20 in English

2 Samuel 7:20 · Berean Standard Bible

What more can David say to You? For You know Your servant, O Lord GOD.

Context

18Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu. 20“Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma. 21Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha. 22“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.