2 Samuel 7:20
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma.
2 Samuel 7:20 in English
2 Samuel 7:20 · Berean Standard Bible
What more can David say to You? For You know Your servant, O Lord GOD.
Context
18Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị:
“Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu. 20“Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma. 21Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha. 22“Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, lee ka i si dị ukwuu! Ọ dịghị onye dịka gị. Ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.