Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu.

2 Samuel 7:19 in English

2 Samuel 7:19 · Berean Standard Bible

And as if this was a small thing in Your eyes, O Lord GOD, You have also spoken about the future of the house of Your servant. Is this Your custom with man, O Lord GOD?*

Context

17Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị. 18Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu. 20“Ma gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị? O, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị. Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma. 21Nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ohu gị mata ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.