2 Samuel 7:17
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị.
2 Samuel 7:17 in English
2 Samuel 7:17 · Berean Standard Bible
So Nathan relayed to David all the words of this entire vision.
Context
15Ma agaghị ewezuga ịhụnanya m site nʼebe ọ nọ, dịka m si wezuga ya site nʼebe Sọl nọ, bụ onye m wezugara site nʼihu gị. 16Ụlọ gị na alaeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nʼihu m. A ga-eme ka ocheeze gị bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 17Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị. 18Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị:
“Onye ka m bụ, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị. Ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, nke a bụkwa ụkpụrụ metụtara mmadụ efu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.