Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu Onyenwe anyị eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị,

2 Samuel 24:11 in English

2 Samuel 24:11 · Berean Standard Bible

When David got up in the morning, a revelation from the LORD had come to Gad the prophet, David’s seer:

Context

9Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise. 10Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị Onyenwe anyị, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, Onyenwe anyị biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.” 11Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu Onyenwe anyị eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị, 12“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ” 13Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.