Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị Onyenwe anyị, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, Onyenwe anyị biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.”

2 Samuel 24:10 in English

2 Samuel 24:10 · Berean Standard Bible

After David had numbered the troops, his conscience was stricken and he said to the LORD, “I have sinned greatly in what I have done. Now, O LORD, I beg You to take away the iniquity of Your servant, for I have acted very foolishly.”

Context

8Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya. 9Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise. 10Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị Onyenwe anyị, “Emehiela m nke ukwuu nʼihi ihe m mere. Ma ugbu a, Onyenwe anyị biko, arịọ m gị, wezuga ikpe ọmụma nke dịịrị ohu gị; nʼihi na emeela m ihe nzuzu dị ukwuu.” 11Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu Onyenwe anyị eruola Gad onye amụma, bụ onye ọhụ ụzọ Devid, sị, 12“Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.