2 Samuel 23:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke Izrel kwuru okwu, Oke nkume Izrel sịrị m, ‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume, mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke.
2 Samuel 23:3 in English
2 Samuel 23:3 · Berean Standard Bible
The God of Israel spoke; the Rock of Israel said to me, ‘He who rules the people with justice, who rules in the fear of God,
Context
1Ndị a bụ okwu ikpeazụ Devid kwuru:
“Okwu pụrụ iche si nʼọnụ Devid, nwa Jesi,
ihe si nʼọnụ nwoke ahụ Chineke Onye kachasị ihe niile elu buliri elu.
Nwoke ahụ onye Chineke nke Jekọb tere mmanụ,
onye bụ ọka nʼịbụ abụ nʼala Izrel. 2“Mmụọ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼọnụ m,
okwu ya dịkwa m nʼire. 3Chineke Izrel kwuru okwu,
Oke nkume Izrel sịrị m,
‘Mgbe mmadụ na-achị ndị ọzọ site nʼezi omume,
mgbe ọ na-achị site nʼegwu Chineke. 4Ọ dị ka ìhè nke ụtụtụ, mgbe anyanwụ na-achawapụta
nʼụtụtụ nke igwe ojii na-adịghị.
Dịka ìhè na-acha mgbe mmiri zochara
nke na-eme ka ahịhịa ndụ na-epupụta nʼala.’ 5“Ọ bụrụ na ihe banyere ụlọ m ezighị ezi nʼebe Chineke nọ.
Nʼezie, ọ garaghị ekwe ka ọgbụgba ndụ ebighị ebi dịrị nʼetiti mụ na ya,
Ọgbụgba ndụ e doro nʼusoro nke e mere ka o guzosie ike nʼụzọ niile.
Nʼezie, ọ garaghị eme ka nzọpụta m zuo oke.
Ma mezukwaara m ọchịchọ obi m niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.