2 Samuel 22:49
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro m. Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike.
2 Samuel 22:49 in English
2 Samuel 22:49 · Berean Standard Bible
who frees me from my enemies. You exalt me above my foes; You rescue me from violent men.
Context
47“Onyenwe anyị na-adị ndụ. Otuto dịrị oke nkume m.
Mbuli elu dịrị Chineke m, bụ oke nkume ahụ, Onye nzọpụta m. 48Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ.
Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m. 49Onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m.
I mere ka m dị elu karịa ndị iro m.
Napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. 50Nʼihi nke a, Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche.
Aga m abụku aha gị abụ otuto. 51“Chineke na-enye eze ya mmeri dị ukwuu.
Ọ na-egosikwa onye ya o tere mmanụ obi ebere.
Ihe ndị a ka ọ na-emere Devid na ụmụ ụmụ ya, ruo mgbe niile ebighị ebi.”
22:5 Mmekpa ahụ nke na-eweta mbibi bịakwasịrị m
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.