Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị.

2 Samuel 21:7 in English

2 Samuel 21:7 · Berean Standard Bible

Now the king spared Mephibosheth son of Jonathan, the son of Saul, because of the oath before the LORD between David and Jonathan son of Saul.

Context

5Ha zara eze sị, “Kwere ka anyị wezuga nwoke ahụ wetaara anyị mbibi na ịla nʼiyi, onye ahụ mere ka anyị ghara inwe ebe obibi ọbụla nʼala Izrel. 6Ka akpọnye anyị ndị ikom asaa site nʼụmụ ya, ka anyị kwụgbuo ha nye Onyenwe anyị na Gibea Sọl, onye Onyenwe anyị họpụtara.” Eze zara sị, “Aga m akpọnye unu ha.” 7Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị. 8Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola. 9O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.