Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị.

2 Samuel 21:9 in English

2 Samuel 21:9 · Berean Standard Bible

And he delivered them into the hands of the Gibeonites, and they hanged them on the hill before the LORD. So all seven of them fell together; they were put to death in the first days of the harvest, at the beginning of the barley harvest.

Context

7Ma eze nwere ọmịiko nʼahụ Mefiboshet nwa Jonatan, nwa Sọl, nʼihi ịgba ndụ dị nʼetiti ya na Jonatan nʼihu Onyenwe anyị. 8Ma eze kpọọrọ Amoni na Mefiboshet, ụmụ ndị ikom abụọ nke Rizpa, nwa nwanyị Aịa, bụ ndị ọ mụtaara Sọl. Nakwa ụmụ ndị ikom ise nke Merab nwa Sọl mụtara mgbe ọ bụ nwunye Adriel, nwa Bazilai onye Mehola. 9O nyefere ha niile nʼaka ndị Gibiọn; ndị Gibiọn kwụbakwara ha nʼugwu nʼihu Onyenwe anyị. Ha asaa nwụrụ nʼotu ụbọchị na mmalite owuwe ihe ubi nke ọka balị. 10Ma Rizpa, nwa nwanyị Aịa were akwa mkpe gbasara onwe ya nʼelu nkume. O kweghịkwa ka anụ ufe bekwasị ha nʼehihie, maọbụ anụ ọhịa nʼabalị. Ọ nọgidere nʼebe ahụ site nʼoge mmalite owuwe ihe ubi tutu ruo mgbe mmiri bidoro izokwasị anụ ahụ ha. 11Mgbe a gwara Devid ihe Rizpa, nwa nwanyị Aịa, iko nwanyị Sọl mere,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.