Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan* nwa Jaịa* onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat,* onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa.

2 Samuel 21:19 in English

2 Samuel 21:19 · Berean Standard Bible

Once again there was a battle with the Philistines at Gob, and Elhanan son of Jair * the Bethlehemite killed the brother of Goliath * the Gittite, the shaft of whose spear was like a weaver’s beam.

Context

17Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.” 18Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai,* onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa. 19Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan* nwa Jaịa* onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat,* onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa. 20Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa. 21Mgbe ọ kọchara Izrel, Jonatan nwa Shimei, nwanne nwoke Devid, gburu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.