Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai,* onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa.

2 Samuel 21:18 in English

2 Samuel 21:18 · Berean Standard Bible

Some time later at Gob, there was another battle with the Philistines. At that time Sibbecai the Hushathite killed Saph,* one of the descendants of Rapha.

Context

16Mgbe ahụ, Ishibi-Benob, otu onye agbụrụ Rafa, onye ịdị arọ nke bronz dị nʼọnụ ùbe ya ruru kilogram atọ na ọkara, onye jikwa mma agha ọhụrụ, bịaruru Devid nso chọọ igbu ya. 17Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.” 18Mgbe oge gaturu, ha na ndị Filistia lụrụ agha ọzọ na Gob. Nʼoge a, Sibekai,* onye Husha, gburu Saf, otu nʼime ndị agbụrụ Rafa. 19Nʼagha ọzọ ha na ndị Filistia lụrụ na Gob, Elhanan* nwa Jaịa* onye Betlehem gburu nwanne Golaịat onye Gat,* onye ùbe ya nwere osisi dị ogologo dịka nke onye na-ekwe akwa ji ekwe akwa. 20Nʼagha ọzọkwa, bụ nke a lụrụ na Gat, e nwere otu nwoke gbara oke dimkpa, nke nwere mkpịsịaka isii nʼaka ya ọbụla, nweekwa mkpịsịụkwụ isii nʼụkwụ ya ọbụla, ya bụ, a gụkọtaa ha niile, iri mkpịsịaka na mkpịsịụkwụ abụọ na anọ. Ọ bụkwa onye amụrụ nʼagbụrụ Rafa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.