Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.”

2 Samuel 2:7 in English

2 Samuel 2:7 · Berean Standard Bible

Now then, be strong and courageous, for though Saul your lord is dead, the house of Judah has anointed me as their king.”

Context

5o zigaara ha ndị ozi ka ha sị ha, “Ka Onyenwe anyị gọzie unu nʼihi obiọma unu gosiri site nʼili Sọl, nna unu ukwu, nʼụzọ kwesiri ekwesi. 6Ka Onyenwe anyị gosikwa unu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi. Mụ onwe m ga-egosikwa unu otu ụdị amara a, nʼihi ihe a unu mere. 7Ma ugbu a, bụrụnụ dike na dimkpa, nʼihi na Sọl nna unu ukwu anwụọla. Ọzọkwa, ndị Juda niile eteela m mmanụ ịbụ eze ha.” 8Ma Abna* nwa Nea, ọchịagha ndị agha Sọl edurularịị Ishboshet, nwa Sọl, dubata ya nʼobodo Mahanaim. 9Ọ nọrọ nʼebe ahụ mee ya eze ndị Gilead, ndị Ashuri* na ndị Jezril; na ndị Ifrem, ndị Benjamin na Izrel niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.