Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ.

2 Samuel 19:5 in English

2 Samuel 19:5 · Berean Standard Bible

Then Joab went into the house and said to the king, “Today you have disgraced all your servants who have saved your life and the lives of your sons and daughters, of your wives, and of your concubines.

Context

3Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha. 4Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!” 5Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ. 6Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na Absalọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ. 7Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.