2 Samuel 19:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha.
2 Samuel 19:3 in English
2 Samuel 19:3 · Berean Standard Bible
So they returned to the city quietly that day, as people steal away in humiliation after fleeing a battle.
Context
1Ọ dịghị anya ozi ruru Joab ntị sị, “Lee, eze na-akwa akwa, na-eru ụjụ nʼihi Absalọm.” 2Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ. 3Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha. 4Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!” 5Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.