2 Samuel 19:2
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ.
2 Samuel 19:2 in English
2 Samuel 19:2 · Berean Standard Bible
And that day’s victory was turned into mourning for all the people, because on that day they were told, “The king is grieving over his son.”
Context
1Ọ dịghị anya ozi ruru Joab ntị sị, “Lee, eze na-akwa akwa, na-eru ụjụ nʼihi Absalọm.” 2Mgbe ndị agha ya nụrụ na eze nọ nʼoke iru ụjụ nʼihi nwa ya, mmeri ha ghọọrọ ha ihu mgbarụ nʼụbọchị ahụ. 3Ndị agha Devid niile zobatasịrị onwe ha nʼime obodo dịka a ga-asị na ha bụ ndị ihere na-eme dịka ndị e meriri nʼagha. 4Eze kpuchiri ihu ya nọgidekwa na-akwa akwa na-asị, “O, nwa m Absalọm! O! Absalọm nwa m, nwa m!”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.