2 Samuel 19:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.”
2 Samuel 19:7 in English
2 Samuel 19:7 · Berean Standard Bible
Now therefore get up! Go out and speak comfort to your servants, for I swear by the LORD that if you do not go out, not a man will remain with you tonight. This will be worse for you than all the adversity that has befallen you from your youth until now!”
Context
5Emesịa, Joab jekwuuru eze nʼụlọ sị ya, “Anyị zọpụtara ndụ gị, na ndụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom, na ndị nwunye gị, na ndị iko gị nwanyị taa, ma lee ka ị si emeso anyị. Ị na-eme ka ihere mee anyị, dịka a ga-asị na anyị mere ihe ọjọọ. 6Ị hụrụ ndị iro gị nʼanya, ma na-akpọ ndị hụrụ gị nʼanya asị. I meela ya ka ọ pụta ìhè taa na o nweghị ihe ndị ọchịagha gị na ndị agha gị bụ nʼanya gị. Ahụrụ m na ọ gaara abụ ihe ziri ezi nʼanya gị ma a sịkwarị na Absalọm dị ndụ taa, ma anyị niile anwụọ. 7Ugbu a, pụọ gaa kelee ndị agha gị. Eji m aha Onyenwe anyị na-aṅụ iyi na-asị na ọ bụrụ na ị pụghị nʼezi kelee ha, otu onye nʼime ha agaghị afọdụ nʼebe a mgbe chi taa jiri, mgbe ahụ ihe ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe niile i jirila anya gị hụ na ndụ gị.” 8Ya mere, eze biliri nọdụ ọdụ nʼọnụ ụzọ ama. Mgbe ndị agha nụrụ na eze nọ nʼọnụ ụzọ ama, ha niile pụtara guzo nʼihu ya.
Ma nʼoge a, ndị Izrel niile agbalaala, onye ọbụla nʼụlọ ya. 9Nʼetiti ebo Izrel niile, ndị mmadụ nọ na-arụ ụka na-asị, “Eze napụtara anyị site nʼaka ndị iro anyị. Ọ bụ ya napụtara anyị site nʼaka ndị Filistia. Ma ugbu a, o sitela nʼala a gbapụ nʼihi Absalọm.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.