Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.

2 Samuel 19:39 in English

2 Samuel 19:39 · Berean Standard Bible

So all the people crossed the Jordan, and then the king crossed over. The king kissed Barzillai and blessed him, and Barzillai returned home.

Context

37Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.” 38Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.” 39Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya. 40Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga. 41Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.