2 Samuel 19:40
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga.
2 Samuel 19:40 in English
2 Samuel 19:40 · Berean Standard Bible
Then the king went on to Gilgal, and Chimham crossed over with him. All the troops of Judah and half the troops of Israel escorted the king.
Context
38Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.” 39Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya. 40Mgbe eze gabigara ruo Gilgal, Kimham sokwa ya gafee. Ndị agha Juda niile na otu ọkara ndị agha Izrel niile mere ka eze gabiga. 41Ọ dịghị anya, ndị ikom Izrel niile nọ na-abịakwute eze na-asị ya, “Gịnị mere ụmụnna anyị, ndị ikom Juda, jiri zopu eze kpọfeta ya na ezinaụlọ na ndị ikom ya niile osimiri Jọdan?” 42Ma ndị ikom Juda zara ndị ikom Izrel, “Anyị mere nke a nʼihi na eze bụ onye metụtara ahụ anyị. Gịnị mere iwe ji ewe unu maka nke a? Anyị eriela ihe ọbụla site na nri eze? Ka anyị anarala ihe ọbụla dobere onwe anyị?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.