Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.”

2 Samuel 19:37 in English

2 Samuel 19:37 · Berean Standard Bible

Please let your servant return, that I may die in my own city near the tomb of my father and mother. But here is your servant Chimham. Let him cross over with my lord the king, and do for him what is good in your sight.”

Context

35Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze? 36Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche. 37Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.” 38Eze zara sị ya, “Ọ dị mma, Kimham ga-eso m gafee, aga m emekwara ya ihe ọma niile ị rịọrọ m.” 39Ya mere, ndị ahụ niile gabigara Jọdan, mgbe ahụ eze gabigakwara. Eze suturu Bazilai ọnụ, gọziekwa ya, Bazilai laghachiri nʼụlọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.