2 Samuel 19:35
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze?
2 Samuel 19:35 in English
2 Samuel 19:35 · Berean Standard Bible
I am now eighty years old. Can I discern what is good and what is not? Can your servant taste what he eats or drinks? Can I still hear the voice of singing men and women? Why should your servant be an added burden to my lord the king?
Context
33Eze gwara Bazilai sị ya, “Soro m gafee osimiri ka i soro m biri na Jerusalem. Aga m elekọtakwa gị.” 34Ma Bazilai zara eze sị ya, “Afọ ole ka ọ fọdụrụ m ịdị ndụ m ga-eji soro eze gaa Jerusalem? 35Agbaala m iri afọ asatọ. Enwere m ike ịkọwa ihe dị iche nʼetiti ihe dị mma na nke na-adịghị mma. O nwere ụzọ ohu gị si anụ ụtọ ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O nwere ụzọ m si anụ olu ndị ikom na ndị inyom na-abụ abụ? Gịnị mere ohu gị ga-eji buru ibu arọ nye onyenwe m na eze? 36Ohu gị ga-eso eze gafee osimiri Jọdan, maọbụ nʼihi gịnị ka eze ga-eji nye m onyinye ọzọ dị iche. 37Biko, ka ohu gị laghachi, ka m nwee ike nwụọ nʼobodo m, nʼakụkụ ili nna m na nne m. Ma lee ohu gị bụ Kimham, ka o soro onyenwe m, bụ eze gafee. Gị mekwara ya ihe ọbụla dị mma nʼanya gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.