2 Samuel 19:24
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo.
2 Samuel 19:24 in English
2 Samuel 19:24 · Berean Standard Bible
Then Mephibosheth, Saul’s grandson, went down to meet the king. He had not cared for his feet or trimmed his mustache or washed his clothes from the day the king had left until the day he returned safely.
Context
22Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?” 23Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.” 24Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo. 25Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?” 26Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.