Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?”

2 Samuel 19:22 in English

2 Samuel 19:22 · Berean Standard Bible

And David replied, “Sons of Zeruiah, what have I to do with you, that you should be my adversaries today? Should any man be put to death in Israel today? Am I not indeed aware that today I am king over Israel?”

Context

20nʼihi na mụ bụ ohu gị maara na m mehiere, ma taa abịara m dịka onye mbụ site nʼagbụrụ Josef, ịbịa zute onyenwe m, bụ eze.” 21Abishai nwa Zeruaya jụrụ eze sị ya, “Ọ bụ na Shimei agaghị anwụ nʼihi ihe a? Nʼihi nkọcha ọ kọchara onye Onyenwe anyị tere mmanụ bụ eze.”* 22Ma Devid sịrị, “Gịnị jikọtara mụ na unu ụmụ ndị ikom Zeruaya, nke mere na taa unu aghọọla ndị na-emegide m? O kwesiri ka e gbuo onye ọbụla nʼala Izrel taa? Ọ bụ na m amaghị na taa, abụ m eze Izrel?” 23Ya mere eze gwara Shimei sị, “I gaghị anwụ. Eze jiri ịṅụ iyi kwee ya nkwa a.” 24Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.