2 Samuel 19:26
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m.
2 Samuel 19:26 in English
2 Samuel 19:26 · Berean Standard Bible
“My lord the king,” he replied, “because I am lame, I said, ‘I will have my donkey saddled * so that I may ride on it and go with the king.’ But my servant Ziba deceived me,
Context
24Mefiboshet, nwa nwa Sọl bịarukwara izute eze. Site nʼụbọchị eze hapụrụ Jerusalem, ọ sabeghị ụkwụ ya, ma uwe ya, ọ kpụghịkwa afụọnụ ya tutu ruo mgbe eze lọtara nʼudo. 25Mgbe o si Jerusalem pụta izute eze, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Mefiboshet, gịnị mere i soghị m gaa?” 26Ọ zara ya sị, “Onyenwe m, eze, agwara m Ziba ohu m ka o doziere m ịnyịnya ibu m, ka m soro eze, ma ebe m bụ onye ngwụrọ, ọ ghọgburu m. 27O kwuluru ohu gị nʼebe onyenwe m bụ eze nọ. Ma onyenwe m bụ eze dịka mmụọ ozi Chineke, nʼihi ya mee m ihe masịrị gị. 28Nʼagbanyeghị na ụlọ nna m niile dịka ndị nwụrụ anwụ nʼebe onyenwe m bụ eze nọ, ma i nyere ohu gị ọnọdụ nʼetiti ndị na-eri nri nʼelu tebul gị. Gịnị bụ ikike ọzọ m nwere iji rịọọ eze arịrịọ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.