Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.”

2 Samuel 18:26 in English

2 Samuel 18:26 · Berean Standard Bible

the watchman saw another man running, and he called out to the gatekeeper, “Look! Another man is running alone!” “This one also brings good news,” said the king.

Context

24Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya. 25Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso, 26onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.” Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.” 27Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,” Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.” 28Mgbe ahụ, Ahimaaz kpọrọ eze oku sị, “Udo!” Ọ kpọrọ isiala nye eze. Kpuokwa ihu ya nʼala sị, “Ngọzị na-adịrị Onyenwe anyị Chineke gị. Onye nke mebiri nzube ndị ahụ niile weliri aka imegide onyenwe m bụ eze.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.