2 Samuel 18:25
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa. Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso,
2 Samuel 18:25 in English
2 Samuel 18:25 · Berean Standard Bible
So he called out and told the king. “If he is alone,” the king replied, “he bears good news.” As the first runner drew near,
Context
23Ọ rịọrọ sị, “Otu ọbụla o si dị, hapụ m ka m gaa.”
Nʼikpeazụ Joab kwenyere sị ya, “Ọ dị mma, gbara ọsọ gaa.” Ahimaaz sitere nʼụzọ dị mkpụmkpụ nke gafere obosara ala Jọdan buru nwoke Kush ahụ ụzọ gbaruo. 24Devid nọ nʼọnụ ụzọ ama nʼoge a. Mgbe onye nche rigoruru nʼelu mgbidi ebe ọ na-anọ, ọ hụrụ otu nwoke ka ọ na-agba ọsọ naanị ya. 25Onye nche ahụ kpọrọ Devid oku gwa ya na o nwere onye na-abịa.
Ma eze zara ya sị, “Ọ bụrụ naanị ya, o nwere oziọma.” Mgbe onyeozi ahụ na-abịaru nso, 26onye nche ahụ lepụkwara anya hụ otu nwoke ọzọ ka o ji ọsọ na-abịa naanị ya. Ọ kpọkwara oku ọzọ sị, “Onye ọzọ na-abịakwa.”
Eze zara sị, “Onye ahụ ga-enwekwa oziọma.” 27Onye nche ahụ zara sị, “Onye nke mbụ na-abịa dị ka Ahimaaz, nwa Zadọk,”
Eze zara sị, “Ọ bụ ezi mmadụ, ọ bụkwa oziọma ka o ji na-abịa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.