2 Samuel 18:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha.
2 Samuel 18:16 in English
2 Samuel 18:16 · Berean Standard Bible
Then Joab blew the ram’s horn, and the troops broke off their pursuit of Israel because Joab had restrained them.
Context
14Joab sịrị, “Ọ bụghị otu a ka m ga na-eche nʼihu gị.” Ya mere, ọ chịịrị ùbe atọ nʼaka ya, dubaa ha nʼobi Absalọm, mgbe Absalọm ka dị ndụ makwụrụ nʼelu osisi ook. 15Ụmụ okorobịa iri ndị na-ebu ihe agha Joab gbara Absalọm gburugburu, tigbuo ya. 16Emesịa, Joab fụrụ opi ike nke mere ka ndị agha Devid na-achụ ndị Izrel kwụsị ịchụ ha ọsọ, nʼihi na Joab kwụsịrị ha. 17Ha buuru ozu Absalọm tụba ya nʼolulu ukwu dị nʼoke ọhịa ahụ, werekwa nkume tụọ ya nʼelu. Ndị agha Izrel niile gbalara nʼụlọ ha. 18Nʼoge Absalọm dị ndụ, o wuuru onwe ya ogidi ncheta. O wuru ogidi a na Ndagwurugwu Eze, nʼihi na o chere nʼime onwe ya sị, “Enweghị m nwa nwoke ga-aza aha m.” Ya mere, ọ gụrụ ogidi ahụ aha nke ya onwe ya. Ọ bụkwa Ogidi Absalọm ka a na-akpọ ya ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.