2 Samuel 15:22
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya.
2 Samuel 15:22 in English
2 Samuel 15:22 · Berean Standard Bible
“March on then,” said David to Ittai. So Ittai the Gittite marched past with all his men and all the little ones who were with him.
Context
20Ọ dịbeghị anya kemgbe ị bịara. M ga-esi aṅaa kwere ka i soro m na-awagharị, ebe ọ bụ na m amaghị ebe m na-aga. Chịrị ndị agha gị laghachi. Ka obiọma na ikwesi ntụkwasị obi dịnyere unu.” 21Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.” 22Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya. 23Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara. 24Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.