Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara.

2 Samuel 15:23 in English

2 Samuel 15:23 · Berean Standard Bible

Everyone in the countryside was weeping loudly as all the people passed by. And as the king crossed the Kidron Valley, all the people also passed toward the way of the wilderness.

Context

21Ma Itai zara eze sị, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, onyenwe m na-adịkwa ndụ, ebe ọbụla onyenwe m bụ eze ga-anọ, ma ọ pụtara ndụ maọbụ ọnwụ, nʼebe ahụ ka odibo gị ga-anọkwa.” 22Devid sịrị Itai, “Gaa nʼihu, gabiga.” Ya mere Itai, onye Git gabigara ya na ndị ikom ya niile, na ezinaụlọ niile ndị so ya. 23Obodo niile tiri mkpu akwa mgbe ndị ahụ niile na-agabiga. Eze gafere ọdọ mmiri Kidrọn, ya na ndị mmadụ niile chere ihu nʼụzọ ọzara. 24Zadọk bịakwara, ya na ndị Livayị niile, ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ha dọbara igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼala. Abịata chụgidere aja tutu ruo mgbe mmadụ niile sitere nʼobodo ahụ gabigasịrị. 25Mgbe ahụ, eze sịrị Zadọk, “Bughachi igbe Chineke a nʼime obodo. Ọ bụrụ na m ahụta amara nʼanya Onyenwe anyị, ọ ga-akpọghachi m mee ka m hụ ya, na ebe obibi ya anya ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.