2 Samuel 14:3
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya.
2 Samuel 14:3 in English
2 Samuel 14:3 · Berean Standard Bible
Then go to the king and speak these words to him.” And Joab put the words in her mouth.
Context
1Joab, nwa Zeruaya matara na obi eze dị nʼebe Absalọm nọ. 2Joab zigara ozi na Tekoa, si nʼebe ahụ kpọta otu nwanyị maara ihe. Mgbe nwanyị ahụ bịaruru, Joab gwara ya sị, “Mee onwe gị dịka onye na-eru ụjụ. Yiri akwa mkpe, etekwala mmanụ otite. Kpaa agwa dịka nwanyị nọ nʼiru ụjụ ogologo oge. 3Emesịa, jekwuru eze, gwa ya okwu ndị a m na-agwa gị.” Joab tinyere okwu ndị ahụ nʼọnụ ya. 4Mgbe nwanyị ahụ si Tekoa gara na nke eze, ọ dara nʼala kpuo ihu ya nʼala ịsọpụrụ eze. Ọ sịrị, “Biko nyere m aka, gị onye a na-asọpụrụ!” 5Eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ mkpa gị?”
Ọ zara sị, “Abụ m nwanyị isi mkpe, di m anwụọla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.