Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl.

2 Samuel 12:7 in English

2 Samuel 12:7 · Berean Standard Bible

Then Nathan said to David, “You are that man! This is what the LORD, the God of Israel, says: ‘I anointed you king over Israel, and I delivered you from the hand of Saul.

Context

5Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ! 6Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.” 7Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl. 8Enyere m gị ụlọ nna gị ukwu, nyefekwa ndị inyom nna gị ukwu nʼaka gị, na alaeze Izrel na Juda, ka ha bụrụ nke gị. Ma ọ bụrụ na nke a ezughị, agaara m atụkwasịrị gị ihe ndị a niile okpukpu okpukpu. 9Gịnị mere i ji lelịa okwu Onyenwe anyị anya, mee ihe a jọgburu onwe ya? Nʼihi na i jirila mma agha gbuo Ụraya onye Het, zurukwa nwunye ya nʼohi. Ọ bụkwa mma agha ndị Amọn ka i ji gbuo ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.