Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ!

2 Samuel 12:5 in English

2 Samuel 12:5 · Berean Standard Bible

David burned with anger against the man and said to Nathan: “As surely as the LORD lives, the man who did this deserves to die!

Context

3Ma nwoke ogbenye ahụ enweghị ihe ọbụla karịa otu nwa nne atụrụ nta nke ọ zụtara. Ọ zụlitere ya, o tolite nʼetiti ya na ụmụ ya. Ọ na-eri nri site na ihe oriri ya, na-aṅụ mmiri site nʼiko mmiri ya, nʼobi ya ka ọ na-edinakwa. Ọ nọ ọnọdụ dịka nwa nwanyị nye ya. 4“Otu ụbọchị, onye ọbịa bịara nʼụlọ onye ọgaranya ahụ. Ma kama ọgaranya ahụ ga-ewere otu atụrụ maọbụ ehi nke ya siere onye ọbịa ya nri, ọ gara were nne atụrụ ogbenye ahụ, gbuo ya, jiri ya siere ọbịa ya nri.” 5Devid were oke iwe megide nwoke ahụ, ọ sịrị Netan, “Ana m aṅụ iyi nʼaha Onyenwe anyị dị ndụ na onye mere ihe dị otu a aghaghị ịnwụ! 6Ọ ga-ejikwa nwa atụrụ okpukpu anọ kwụghachi ogbenye ahụ ụgwọ otu atụrụ ahụ o weere, nʼihi na onye ọgaranya ahụ egosighị na o nwere obi ebere ọbụla.” 7Mgbe ahụ, Netan sịrị Devid, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ! Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Mụ onwe m tere gị mmanụ ịbụ eze Izrel, mụ onwe m napụtakwara gị site nʼaka Sọl.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.