Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala.

2 Samuel 10:8 in English

2 Samuel 10:8 · Berean Standard Bible

The Ammonites marched out and arrayed themselves for battle at the entrance of the city gate, while the Arameans of Zobah and Rehob and the men of Tob and Maacah were by themselves in the open country.

Context

6Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob. 7Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha. 8Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. 9Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. 10O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.