Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha.

2 Samuel 10:10 in English

2 Samuel 10:10 · Berean Standard Bible

And he placed the rest of the forces under the command of his brother Abishai, who arrayed them against the Ammonites.

Context

8Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. 9Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram. 10O tinyere ndị ikom fọdụrụ nʼokpuru ọchịchị Abishai, nwanne ya, zipụkwa ha izute ndị Amọn nʼagha. 11Joab sịrị, “Ọ bụrụ na ndị agha Aram akarịa m ike, pụta bịa nyere m aka; ma ọ bụrụkwanụ na ndị Amọn akarịa gị ike, aga m apụta bịa napụta gị. 12Nwee obi ike, ka anyị lụọ ọgụ a dịka ndị dị ike, nʼihi ndị anyị, na obodo niile nke Chineke anyị. Ka Onyenwe anyị meekwa ihe dị mma nʼanya ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.