2 Samuel 10:7
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha.
2 Samuel 10:7 in English
2 Samuel 10:7 · Berean Standard Bible
On hearing this, David sent Joab and the entire army of mighty men.
Context
5Mgbe a gwara Devid ihe mere, o zipụrụ ndị ozi ka ha gaa zute ndị ikom ahụ, nʼihi na e mere ha ihe ihere nʼebe ọ dị ukwuu. Eze sịrị, “Nọdụnụ na Jeriko ruo mgbe afụọnụ unu tolitere, mgbe ahụ unu ga-alọta.” 6Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, ha gara goo iri puku ndị agha abụọ ji ụkwụ eje site nʼAram, Bet-Rehob nakwa Zoba. Ha gokwara eze Maaka ya na puku ndị ikom, tinyekwara iri puku ndị ikom na puku abụọ ọzọ site nʼala Tob. 7Mgbe Devid nụrụ nke a, o zipụrụ Joab na ndị agha ya niile bụ dike na dimkpa nʼagha. 8Ndị Amọn pụtara doo onwe ha nʼusoro ibu agha, nʼọnụ ụzọ ama nke obodo ha. Ma ndị Aram, ndị si Zoba na Rehob, na ndị ikom Tob na Maaka, nọpụrụ onwe ha na mbara ala. 9Mgbe Joab hụrụ na agha dị megide ya nʼihu na azụ, ọ họpụtara ụfọdụ ndị ọkachamara site nʼetiti ndị agha Izrel, doo ha nʼusoro izute ndị Aram.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.