2 Samuel 1:9
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
2 Samuel 1:9 in English
2 Samuel 1:9 · Berean Standard Bible
Then he begged me, ‘Stand over me and kill me, for agony has seized me, but my life still lingers.’
Context
7Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’ 8“Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’
“Azara m ya sị, ‘Abụ m onye Amalek.’ 9“Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’ 10“Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.” 11Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.