Native Bible

2 Peter 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya.

2 Peter 1:16 in English

2 Peter 1:16 · Berean Standard Bible

For we did not follow cleverly devised fables when we made known to you the power and coming of our Lord Jesus Christ, but we were eyewitnesses of His majesty.

Context

14Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ* ya nʼoge na-adịghị anya. 15Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile. 16Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya. 17Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”* 18Anyị onwe anyị nụrụ olu ahụ si nʼeluigwe daa mgbe anyị so ya nọdụ nʼelu ugwu nsọ ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.