Native Bible

2 Peter 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile.

2 Peter 1:15 in English

2 Peter 1:15 · Berean Standard Bible

And I will make every effort to ensure that after my departure, you will be able to recall these things at all times.

Context

13Ana m agụ ya nʼihe ziri ezi ịkpọte mmụọ unu na uche unu site nʼichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nʼanụ ahụ a. 14Nʼihi na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoohaa, na m ga-eyipụ* ya nʼoge na-adịghị anya. 15Aga m agbalịsi ike ịhụ na mgbe m hapụchara ụwa nke a, unu ga na-echeta ihe ndị a mgbe niile. 16Ihe niile anyị na-akọrọ unu abụghị akụkọ ifo mmadụ kọrọ site nʼamamihe ya. Nʼihi na anyị kọwaara unu ihe banyere ike Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ọbịbịa ọ ga-abịa ọzọ. Ọ bụ anya anyị abụọ ka anyị ji hụ ebube nke ịbụ eze ya. 17Nʼihi na ọ natara nsọpụrụ na ebube site nʼaka Chineke bụ Nna mgbe olu ahụ si nʼebube ahụ dị ukwuu daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya, onye ihe ya dị m ezi mma.”*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.