2 Ndị Eze 9:33
2 Kings 9:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
2 Kings 9:33 in English
2 Kings 9:33 · Berean Standard Bible
“Throw her down!” yelled Jehu. So they threw her down, and her blood splattered on the wall and on the horses as they trampled her underfoot.
Context
31Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.” 32Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya. 33Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya. 34Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”* 35Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.