2 Ndị Eze 9:32
2 Kings 9:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya.
2 Kings 9:32 in English
2 Kings 9:32 · Berean Standard Bible
He looked up at the window and called out, “Who is on my side? Who?” And two or three eunuchs looked down at him.
Context
30Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi. 31Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.” 32Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya. 33Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya. 34Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.