2 Ndị Eze 8:27
2 Kings 8:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab.
2 Kings 8:27 in English
2 Kings 8:27 · Berean Standard Bible
And Ahaziah walked in the ways of the house of Ahab and did evil in the sight of the LORD like the house of Ahab, for he was a son-in-law of the house of Ahab.
Context
25Nʼafọ nke iri na abụọ nke ọchịchị Joram nwa Ehab, bụ eze Izrel, ka Ahazaya nwa Jehoram, bụ eze Juda malitere ịchị. 26Ahazaya gbara iri afọ abụọ na abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị otu afọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Atalaya,* nwa nwa Omri, eze Izrel 27O soro ụzọ niile nke ndị ezinaụlọ Ehab, mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị dịka ezinaụlọ Ehab mere, nʼihi na ọ lụrụ nwanyị si nʼezinaụlọ Ehab. 28Ahazaya sooro Joram nwa Ehab, gaa ibuso Hazael eze Aram* agha na Ramọt Gilead. Ndị Aram merụrụ Joram ahụ. 29Ya mere, eze Joram lọghachitere na Jezril, ka a gwọọ ya mmerụ ahụ ndị Aram merụrụ ya na Ramọt, nʼagha nke ya na Hazael eze Aram lụrụ.
Mgbe ahụ, Ahazaya nwa Jehoram eze Juda, gara Jezril ileta Joram nwa Ehab, nʼihi na e merụrụ ya ahụ.
8:2 Ọ bụghị naanị nʼala Filistia na-emepụta nri karịa ala ugwu ugwu Izrel, kama ndị agha Siria adịghị e buso ha agha mgbe mgbe, dịka ha na-eme ndị Izrel.
8:9 Damaskọs, bụ isi obodo dị mkpa ebe a na-azụ ahịa, nke dị nʼetiti mba Ijipt, na Eshịa nke mpaghara Tọki na Mesopotamịa.
8:21 Joram, nke a bụ ịkpọbiri aha a na nkenke
8:26 Atalaya, bụ nwunye Joram, bụrụkwa nwa eze Ehab, onye Jezebel mụrụ ya. 2Ih 21:6
8:28 Maọbụ, Siria
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.