Native Bible

2 Kings 6:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe eze Izrel na-agafe nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu, otu nwanyị kpọkuru ya sị ya, “Nyere m aka, onyenwe m eze.”

2 Kings 6:26 in English

2 Kings 6:26 · Berean Standard Bible

As the king of Israel was passing by on the wall, a woman cried out to him, “Help me, my lord the king!”

Context

24Ma mgbe ụfọdụ oge gasịrị, Ben-Hadad, eze Aram, chịkọtara ndị agha ya niile pụta bịa gbaa Sameria gburugburu. 25Nʼihi nke a, oke ụnwụ dara nʼobodo Sameria. Nri kọrọ nʼala ahụ ruo na e bidoro ire otu isi ịnyịnya ibu* iri shekel ọlaọcha asatọ. E rekwara nsị nduru shekel ise. 26Mgbe eze Izrel na-agafe nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu, otu nwanyị kpọkuru ya sị ya, “Nyere m aka, onyenwe m eze.” 27Ma eze zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekweghị inyere gị aka, ebee ka m ga-esi nwetara gị inyeaka? Ọ bụ site nʼebe ịzọcha ọka? Ka ọ bụ nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị?” 28Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị na-eme?” Ọ zara, “Nwanyị a sịrị, ‘Nye nwa gị nwoke ka anyị rie ya taa, echi anyị ga-eri nwa m nwoke.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.