Native Bible

2 Kings 6:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị na-eme?” Ọ zara, “Nwanyị a sịrị, ‘Nye nwa gị nwoke ka anyị rie ya taa, echi anyị ga-eri nwa m nwoke.’

2 Kings 6:28 in English

2 Kings 6:28 · Berean Standard Bible

Then the king asked her, “What is the matter?” And she answered, “This woman said to me, ‘Give up your son, that we may eat him, and tomorrow we will eat my son.’

Context

26Mgbe eze Izrel na-agafe nʼelu mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu, otu nwanyị kpọkuru ya sị ya, “Nyere m aka, onyenwe m eze.” 27Ma eze zara sị ya, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekweghị inyere gị aka, ebee ka m ga-esi nwetara gị inyeaka? Ọ bụ site nʼebe ịzọcha ọka? Ka ọ bụ nʼebe ịzọcha mmanya vaịnị?” 28Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị na-eme?” Ọ zara, “Nwanyị a sịrị, ‘Nye nwa gị nwoke ka anyị rie ya taa, echi anyị ga-eri nwa m nwoke.’ 29Ya mere, na anyị siri nwa m rie ya. Nʼụbọchị nke so ya asịrị m ya, ‘Wepụta nwa gị nwoke ka anyị rie ya,’ ma o zoola ya.” 30Mgbe eze nụrụ okwu nwanyị a, ọ dọwara uwe ya. Ma dịka ọ na-agabiga nʼelu mgbidi ahụ, ndị mmadụ lere anya hụ nʼokpuru uwe, akwa mkpe dị nʼime ahụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.