Native Bible

2 Kings 5:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.”

2 Kings 5:25 in English

2 Kings 5:25 · Berean Standard Bible

When Gehazi went in and stood before his master, Elisha asked him, “Gehazi, where have you been?” “Your servant did not go anywhere,” he replied.

Context

23Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi. 24Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ. 25Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.” 26Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi? 27Nʼihi nke a, ekpenta ahụ dị Neeman ga-abịakwasị gị, na ụmụ ụmụ gị, ruo mgbe ebighị ebi.” Ya mere, Gehazi ghọrọ onye ekpenta si nʼihu ya pụọ. Anụ ahụ ya bidokwara ịcha ọcha dịka ogho ọcha. 5:1 Aha eze a, bụ Ben-Hadad nke abụọ 2Ez 8:7 5:5 Aha eze a, bụ Joram. 2Ez 8:28 5:12 A na-akpọkwa ya Amana

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.