Native Bible

2 Kings 5:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ.

2 Kings 5:24 in English

2 Kings 5:24 · Berean Standard Bible

When Gehazi came to the hill, he took the gifts from the servants and stored them in the house. Then he dismissed the men, and they departed.

Context

22“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ” 23Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi. 24Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ. 25Mgbe ọ batara nʼụlọ guzo nʼihu nna ya ukwu, Ịlaisha jụrụ ya sị, “Ebee ka i si na-abịa Gehazi?” Ọ zara, “Ohu gị ejeghị ebe ọbụla.” 26Mgbe ahụ Ịlaisha zara ya, “Ọ bụ na mmụọ m esoghị gị mgbe nwoke ahụ si nʼụgbọ ya rịdata izute gị? Oge a ọ bụ oge ịnara ego, na ịnara uwe, na ịnara ubi oliv, na ubi vaịnị, na igwe ehi, na igwe atụrụ, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom na-eje ozi?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.