Native Bible

2 Kings 5:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ”

2 Kings 5:22 in English

2 Kings 5:22 · Berean Standard Bible

“Everything is all right,” Gehazi replied. “My master has sent me to say, ‘I have just now discovered that two young men from the sons of the prophets have come to me from the hill country of Ephraim. Please give them a talent of silver * and two sets of clothing.’”

Context

20Gehazi, bụ onyeozi Ịlaisha onye nke Chineke, sịrị nʼobi ya, “Nna m ukwu emezighị ikwere ka Neeman onye Aram laa na-anataghị ya ihe o ji bịa. Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, aga m eji ọsọ gbakwuru ya napụta ya ụfọdụ ihe ahụ.” 21Ya mere, Gehazi gbara ọsọ gbakwuru Neeman. Mgbe Neeman hụrụ ya ka ọ gba ọsọ na-abịa, o si nʼelu ụgbọ agha ya wudata gaa zute ya, jụọ ya sị: “Udo ọ dịkwa?” 22“E, udo dị,” ka Gehazi zara, “Onyenwe m zitere m ka m gwa gị, ‘Lee, ụmụ okorobịa abụọ nʼetiti ndị amụma si nʼugwu Ifrem bịakwute m. Biko nye ha otu talenti ọlaọcha na uwe mgbanwe abụọ.’ ” 23Ma Neeman zara sị ya, “Biko, were talenti abụọ.” Ọ kwagidere Gehazi ka ọ nara ha. O kechiri talenti ọlaọcha abụọ ahụ nʼakpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ. O bunyere ndị ohu ya ka ha buru ya na-aga nʼihu Gehazi. 24Ma mgbe ha rutere nʼugwu, Gehazi naara ndị ohu Neeman ihe ndị ahụ, sị ha laghachikwa. O zoro ihe ndị ahụ nʼime ụlọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.