Native Bible

2 Kings 4:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.”

2 Kings 4:42 in English

2 Kings 4:42 · Berean Standard Bible

Now a man from Baal-shalishah came to the man of God with a sack of twenty loaves of barley bread from the first ripe grain. “Give it to the people to eat,” said Elisha.

Context

40Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya. 41Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ. 42Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.” 43Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ” 44Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị. 4:1 Ọ sọpụụrụ Onyenwe anyị 4:2 Mmanụ bụ otu ngwa nri dị mkpa na nri niile ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ na-eri. Mkpa ọ dị bụ na ọ na-edozi ahụ mmadụ. 4:25 Njem a, ga-abụ ihe dị ka kilomita iri atọ site nʼobodo Shunem ruo nʼugwu a. 4:39 Mkpụrụ afụfa ọhịa yiri kukumba nʼọdịdị, buo ibu dịka oroma ma ọ na-elu ilu nʼọnụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.