Native Bible

2 Kings 4:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya.

2 Kings 4:40 in English

2 Kings 4:40 · Berean Standard Bible

And they poured it out for the men to eat, but when they tasted the stew they cried out, “There is death in the pot, O man of God!” And they could not eat it.

Context

38Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.” 39Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa,* nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ. 40Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya. 41Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ. 42Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.