Native Bible

2 Kings 4:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa,* nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ.

2 Kings 4:39 in English

2 Kings 4:39 · Berean Standard Bible

One of them went out to the field to gather herbs, and he found a wild vine from which he gathered as many wild gourds as his garment could hold. Then he came back and cut them up into the pot of stew, though no one knew what they were.

Context

37Ọ batara, daa nʼala nʼụkwụ ya, kpọọ isiala. Emesịa, o kuuru nwa ya nwoke pụọ. 38Ịlaisha lọghachiri na Gilgal, mgbe ụnwụ dị nʼala ahụ. Otu ụbọchị, mgbe ya na ụfọdụ ndị amụma nọ na-enwe nzukọ, ọ gwara onye na-ejere ya ozi okwu sị ya: “Sikwasị ite ukwu ahụ nʼọkụ, siere ndị a mụ na ha nọ ihe oriri.” 39Otu onye nʼime ha pụrụ banye nʼọhịa ịchịkọta akwụkwọ nri. Ọ hụrụ osisi vaịnị toro nʼọhịa, chịkọtaa ụfọdụ afụfa ọhịa,* nke o kpojuru nʼuwe mwụda ya dịka ọ ga-ejideli. Mgbe ọ lọghachiri, o gbupịasịrị afụfa ọhịa ndị a, wụnye ha nʼime ite ahụ si nʼọkụ, ọ bụ ezie na o nweghị onye maara ihe ha bụ. 40Mgbe o ghere, a wụpụtara ya nye ndị ikom ndị ahụ. Ma mgbe ha bidoro iri ya, ha tiri mkpu akwa sị, “Onye nke Chineke, lee, ọnwụ dị nʼite nri a.” Ha enwekwaghị ike iri ya. 41Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.