2 Ndị Eze 4:43
2 Kings 4:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?” Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ”
2 Kings 4:43 in English
2 Kings 4:43 · Berean Standard Bible
But his servant asked, “How am I to set twenty loaves before a hundred men?” “Give it to the people to eat,” said Elisha, “for this is what the LORD says: ‘They will eat and have some left over.’”
Context
41Ịlaisha kwuru okwu sị, “Kpotanụ ụtụ ọka.” Ọ ghanyere ya nʼime ite ahụ sị, “Kunyerenụ ha nri ka ha rie.” Ha riri ya. O nwekwaghị ihe na-egbu egbu dị nʼite ahụ. 42Otu nwoke si Baal-Shalisha bịa, butere onye nke Chineke ogbe achịcha iri abụọ nke e ji ọka balị mbụ a ghọtara nʼubi mee. O butekwaara ya isi ọka ole na ole nʼakpa. Ịlaisha sịrị, “Were ihe ndị a nye ndị anyị ka ha rie.” 43Onye na-ejere ya ozi jụrụ, “Olee otu m ga-esi chee ihe a nʼihu narị mmadụ?”
Ma Ịlaisha zara, “Chịrị ya nye ndị mmadụ a ka ha rie, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ha ga-eriju afọ ha, nwekwa ndị ga-afọdụkwa.’ ” 44Ya mere, o chere ya nʼihu ha, ha rikwara, nri ahụ fọdụkwara dịka okwu Onyenwe anyị si dị.
4:1 Ọ sọpụụrụ Onyenwe anyị
4:2 Mmanụ bụ otu ngwa nri dị mkpa na nri niile ndị si na mpaghara ọwụwa anyanwụ na-eri. Mkpa ọ dị bụ na ọ na-edozi ahụ mmadụ.
4:25 Njem a, ga-abụ ihe dị ka kilomita iri atọ site nʼobodo Shunem ruo nʼugwu a.
4:39 Mkpụrụ afụfa ọhịa yiri kukumba nʼọdịdị, buo ibu dịka oroma ma ọ na-elu ilu nʼọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.